Psalms 19

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Akaọrụ Chineke na iwu ya

1Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;
mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,
ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,
ma a na-anụ ụda ha.
4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

7Iwu Onyenwe anyị zuruoke;
ọ na-eweghachi mkpụrụobi.
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,
ọ na-enye anya ìhè.
9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi.

10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,
karịa ọlaedo a nụchara anụcha;
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile?
Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
13Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị.
Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m.
Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke,
onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.

14Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m,
ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile,
bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
Copyright information for IboBIU